21
 1 Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị, 
nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma. 
 2 Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya, 
ma Onyenwe anyị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile. 
 3 Ime ezi omume na ihe ziri ezi 
ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja. 
 4 Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ 
nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie. 
 5 Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru, 
dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ. 
 6 Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide, 
ha bụ nkuume ifufe na-efesa, ndị na-achọ ya na-achọ ọnwụ. 
 7 Nʼihi na ndị na-emebi iwu anaghị eme ihe ọma, 
ihe ọjọọ ha na-eme na-alaghachi laa ha nʼiyi. 
 8 Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ, 
ma omume onye aka ya dị ọcha ziri ezi. 
 9 Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ 
karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu. 
 10 Ihe na-atọ onye ọjọọ ụtọ bụ imerụ ndị ọzọ ahụ; 
ọ maghị imere mmadụ ibe ya ebere. 
 11 Mgbe a na-ata onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-enweghị uche na-enweta amamihe, 
ma mgbe a na-akụziri onye maara ihe ihe ọ na-enweta ihe ọmụma. 
 12 Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anya 
na-emekwa ka ndị ajọ omume laa nʼiyi. 
 13 Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye, 
ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu ma agaghị aza ya. 
 14 Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ, 
otu a kwa, ngarị ezonyere nʼime uwe na-eme ka oke ọnụma dajụọ. 
 15 Onye ezi omume na-aṅụrị ọṅụ mgbe e kpere ikpe ziri ezi, 
ma bụrụ ihe oke egwu dịrị ndị na-eme ajọ ihe. 
 16 Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe ya 
ga-eso nʼotu ndị nwụrụ anwụ. 
 17 Nwoke hụrụ ibi ndụ nganga nʼanya na-ada ụkpa; 
ịṅụ mmanya na oke oriri abụghị ụzọ esi akpata akụ. 
 18 Onye ajọ omume ga-abụ ihe mgbapụta maka onye ezi omume, 
onye aghụghọ ga-abụkwa ihe mgbapụta maka onye ndụ ya ziri ezi. 
 19 Ọ ka mma ibi nʼọzara 
karịa ibinyere nwanyị na-atamu ntamu na-esekwa okwu. 
 20 Onye maara ihe na-edebe ezi ihe oriri na mmanụ oliv nʼụlọ ya, 
ma onye nzuzu na-eloda ihe niile nʼọnụ ya. 
 21 Onye na-achụso ezi omume na ịhụnanya 
ga-achọta ndụ, na ugwu na ọganihu. 
 22 Onye maara ihe nwere ike megide obodo ndị dike, 
kwatuokwa ebe ewusiri ike nke ha tụkwasịrị obi ha. 
 23 Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya 
na-egbochiri onwe ya ọdachi. 
 24 Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya. 
Ọ na-eji oke nganga eme ihe niile. 
 25 Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ 
nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ. 
 26 Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa, 
ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke. 
 27 Chineke kpọrọ aja ndị na-emebi iwu asị, 
nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha na-enye onyinye a site na nzube ọjọọ. 
 28 Onyeama ụgha ga-ala nʼiyi, 
ma onye ọbụla na-ege ya ntị ka a ga-ebibi ruo ebighị ebi. 
 29 Ndị ajọ omume na-ebi ndụ atụghị egwu, 
ma ndị omume ha ziri ezi na-atụgharị uche nʼụzọ ha niile. 
 30 O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla, 
nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị. 
 31 E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha, 
maọbụ naanị Onyenwe anyị na-enye mmeri.