Abụ Ọma 121
Abụ nrigo.
Inyeaka si nʼebe Onyenwe anyị nọ
1 Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile,
olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?
2 Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị,* 121:2 Abụ 124:8
onye kere eluigwe na ụwa bịa.
 
3 Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ,
onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;
4 nʼezie onye na-eche Izrel nche
adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra.
 
5  Onyenwe anyị na-eche gị nche,
Onyenwe anyị bụ ndo† 121:5 Aịz 25:4 gị nʼaka nri gị;
6 anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie,
ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị.
 
7  Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị.
Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.
8  Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata,
site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.

*Abụ Ọma 121:2 121:2 Abụ 124:8

†Abụ Ọma 121:5 121:5 Aịz 25:4