Abụ Ọma 45
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Okoko osisi lili.” Abụ maskil ụmụ Kora. Abụ maka agbamakwụkwọ.
Abụ ọlụlụ nwunye eze
1 Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m,
mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze;
ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ.
2 I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ,
e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ,
ebe ọ bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi.
3 Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike;
yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe.
4 Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri,
nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume;
ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya.
5 Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze;
ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị.
6 O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ
7 Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị;
ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị,
site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.
8 Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ* 45:8 Nke a bụ mmanụ isi ọma a na-efesa nʼuwe. Ọ nọ nʼọnọdụ ihe anyị na-akpọ senti taa. Abk 1:12-13. máá na aloos na akashia;
ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma.
Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ.
9 Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ;
nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị.
10 Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu:
“Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị.
11 Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike.
Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.”
12 Ada Taịa† 45:12 Eze mbụ kwụnyeere ọchịchị alaeze Devid bụ eze obodo Taịa, nʼihi Solomọn na eze Taịa nweere ezigbo mmekọrịta dị mma. Taịa bụ isi obodo ebe niile a na-azụ ahịa nʼakụkụ osimiri Mediterenịan. ga-eji onyinye bịa;
ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma.
13 Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya;
ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya.
14 Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị;
ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi
mgbe e dubatara ya nʼụlọeze.
15 E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha;
ha bara nʼime ụlọeze.
16 Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị;
ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile.
17 Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile;
nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.
*Abụ Ọma 45:8 45:8 Nke a bụ mmanụ isi ọma a na-efesa nʼuwe. Ọ nọ nʼọnọdụ ihe anyị na-akpọ senti taa. Abk 1:12-13.
†Abụ Ọma 45:12 45:12 Eze mbụ kwụnyeere ọchịchị alaeze Devid bụ eze obodo Taịa, nʼihi Solomọn na eze Taịa nweere ezigbo mmekọrịta dị mma. Taịa bụ isi obodo ebe niile a na-azụ ahịa nʼakụkụ osimiri Mediterenịan.