16
1 Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime,
ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.
2 Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya,
ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.
3 Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị,
ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.
4 Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya,
o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.
5 Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị.
Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.
6 Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie;
ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.
7 Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ,
ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.
8 Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume
karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.
9 Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị,
maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.
10 Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta,
ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.
11 Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị,
ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha.
12 Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị,
nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.
13 Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu,
ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ.
14 Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ.
Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ.
15 Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ,
ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.* 16:15 Mmiri ozuzo nʼoge ọkọchị na-eme ka ahịhịa kpọnwụrụ akpọnwụ tutee, nke a na-eweta ọnụ, nʼihi olileanya ọ na-enye banyere ụba nke ihe a kụrụ nʼubi.
16 Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe
karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.
17 Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ,
ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.
18 Nganga na-eweta ịla nʼiyi,
mpako na-ewetakwa ọdịda.
19 Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga,
na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.
20 Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma,
onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
21 A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere.
Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.
22 Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya,
ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.
23 Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya,
egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu.
24 Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ,
ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.
25 Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,
ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
26 Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ;
agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu.
27 Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ,
egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ.
28 Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu;
ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi.
29 Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha,
na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi.
30 Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ,
onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie.
31 Isi awọ bụ okpueze nke mara mma,
a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.
32 Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya.
Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.
33 A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị,
maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.
*16:15 16:15 Mmiri ozuzo nʼoge ọkọchị na-eme ka ahịhịa kpọnwụrụ akpọnwụ tutee, nke a na-eweta ọnụ, nʼihi olileanya ọ na-enye banyere ụba nke ihe a kụrụ nʼubi.