Abụ Ọma 3
Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ.
Ekpere maka enyemaka
O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.
Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,
“Chineke agaghị azọpụta ya.”
Sela
* 3:2 Okwu Hibru nʼusoro abụ nke a na-amaghị ihe ọ pụtara, ụfọdụ na-eche na ọ bụ okwu ntụziaka nye ndị ọbụ abụ banyere ihe ha ga-eme
 
Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;
I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.
Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa,
ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m.
Sela
 
Edinara m ala, hie ụra,
ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.
A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,
agaghị m atụ egwu ọbụla.
 
Bilie Onyenwe anyị!
Zọpụta m Chineke m!
Tie ndị iro m niile aka nʼagba; 3:7 Job 16:10
tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.
 
Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa.
Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile.
Sela

*Abụ Ọma 3:2 3:2 Okwu Hibru nʼusoro abụ nke a na-amaghị ihe ọ pụtara, ụfọdụ na-eche na ọ bụ okwu ntụziaka nye ndị ọbụ abụ banyere ihe ha ga-eme

Abụ Ọma 3:7 3:7 Job 16:10