Abụ Ọma 149
Abụ otuto
1 Toonu Onyenwe anyị!
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ.
Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.
2 Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha;
ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze* 149:2 Nkp 8:23; Zek 9:9; Mat 21:5 ha.
3 Ka ha jiri ite egwu too aha ya
ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.
4 Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.
Ọ na-eji nzọpụta† 149:4 Abụ 132:16; Aịz 61:10 kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.
5 Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a,
bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.
6 Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha,
ka mma agha ihu abụọ‡ 149:6 Hib 4:12; Mkp 1:16 dịrịkwa nʼaka ha,
7 iji bọọrọ mba niile ọbọ
taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ,
8 iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha
na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe,
9 imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha.
Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya.
Toonu Onyenwe anyị.
*Abụ Ọma 149:2 149:2 Nkp 8:23; Zek 9:9; Mat 21:5
†Abụ Ọma 149:4 149:4 Abụ 132:16; Aịz 61:10
‡Abụ Ọma 149:6 149:6 Hib 4:12; Mkp 1:16