Abụ Ọma 113
Abụ otuto 
 1 Toonu Onyenwe anyị! 
Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya. 
Toonu aha Onyenwe anyị. 
 2 Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi 
site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. 
 3 Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya, 
aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto. 
 4  Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile, 
ebube ya dị elu karịa eluigwe. 
 5 Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị, 
onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu, 
 6 onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị 
eluigwe na ụwa anya? 
 7 Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu 
sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu; 
 8 ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ, 
ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ. 
 9 Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya 
dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi. 
Toonu Onyenwe anyị.